Luke 9
Yoruba Contemporary Bible (Biblica) (yo) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe ọ kpọkọtara ndị ozi iri na abụọ ahụ, o nyere ha ike na ịchị isi nʼebe mmụọ ọjọọ niile nọ na ịgwọ ọrịa dị iche iche.
- 2
O nyere ha ikike, zipụ ha ikwusa alaeze Chineke na ịgwọ ndị nrịa nrịa.
- 3
Ọ gwara ha sị,“Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, maọbụ mkpanaka maọbụ akpa, maọbụ achịcha maọbụ ego maọbụ uwe abụọ.
- 4
Ụlọ ọbụla unu banyere, nọgidenụ nʼebe ahụ ruo mgbe unu hapụrụ obodo ahụ.
- 5
Ma ebe ọbụla a na-anabataghị unu, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ nʼobodo ahụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.”
- 6
Ha gara nʼobodo nta niile na-ekwusa oziọma na-agwọkwa ndị ọrịa nʼebe niile.
- 7
Mgbe Herọd onye ọchịchị nụrụ akụkọ banyere ihe niile merenụ, ọ gbagwojuru ya anya nʼihi na ụfọdụ mmadụ na-asị, na Jọn omee baptizim esitela na ndị nwụrụ anwụ bilie.
- 8
Ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ebe ndị ọzọ na-asị na otu nʼime ndị amụma ochie apụtakwala ndụ ọzọ.
- 9
Ma Herọd sịrị, “Mụ onwe bipụrụ isi Jọn. Onye bụkwa onye a nke m na-anụ ihe banyere ya?” Ọ gụrụ ya agụụ ịhụ ya.
- 10
Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. Ọ kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha.
- 11
Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.
- 12
Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.”
- 13
Ọ zara ha sị,“Unu nye ha nri ka ha rie.” Ha zaghachiri ya sị, “Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri.”
- 14
Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị,“Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.”
- 15
Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala.
- 16
O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ.
- 17
Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.
- 18
Otu ụbọchị mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị,“Onye ka igwe mmadụ na-asị na m bụ?”
- 19
Ha zara sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa, sị na ị bụ otu nʼime ndị amụma ochie ahụ si nʼọnwụ bilie.”
- 20
Ma ọ jụrụ ha,“Unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst nke Chineke.”
- 21
Ma ọ dọrọ ha aka na ntị, nyesiekwa ha iwu ike ka ha ghara ịgwa onye ọbụla nke a,
- 22
na-asị,“Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche. Ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.”
- 23
Mgbe ahụ ọ sịkwara ha,“Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m nʼazụ, ọ ghaghị ịjụ onwe ya ma buru obe ya kwa ụbọchị na-eso m.
- 24
Nʼihi na onye ọbụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla nke tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-azọpụta ya.
- 25
Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya?
- 26
Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.
- 27
“Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke.”
- 28
Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ọ kpọọrọ Pita na Jọn na Jemis gaa nʼelu ugwu ikpe ekpere.
- 29
Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ụdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya bidoro ịchaa ọcha nke ukwuu.
- 30
Nʼotu ntabi anya, ha hụrụ ndị ikom abụọ ka ha na ya na-ekwu okwu. Ha bụ Mosis na Ịlaịja.
- 31
Ha pụtara nʼebube eluigwe dị ukwu na-ekwu banyere nlaghachi ya, nke ọ na-aga imezu na Jerusalem.
- 32
Pita na ndị ya na ha nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube ya na ndị ikom abụọ ya na ha nọ na-ekwurịta okwu.
- 33
Mgbe ha na-ahapụ ya, Pita sịrị Jisọs, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adị mma ka anyị nọrọ ebe a ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị, otu ga-abụ nke Mosis, otu ga-abụkwa nke Ịlaịja.” Ọ mataghị ihe ọ na-ekwu.
- 34
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Egwu tụkwara ha dị ka ha na-aba nʼigwe ojii ahụ.
- 35
Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara; geenụ ya ntị.”
- 36
Mgbe olu ahụ kwusiri okwu, ha chọpụtara na Jisọs nọ naanị ya. Ndị na-eso ụzọ ya kpuchiri ọnụ ha, debe ihe niile nʼobi ha, ọ dịkwaghị onye ọbụla ha gwara ihe ha hụrụ.
- 37
Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya.
- 38
Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere.
- 39
Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ.
- 40
Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.”
- 41
Jisọs zara sị,“Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!”
- 42
Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya.
- 43
Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya. Jisọs ekwuo ihe banyere ọnwụ ya ọzọ Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,
- 44
“Geenụ ntị nke ọma banyere ihe m chọrọ ịgwa unu. A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ.”
- 45
Ma ha aghọtaghị okwu a. E zonarịrị ya nʼebe ha nọ ka ha ghara ịghọta ya. Egwu tụkwara ha ịjụ ya ihe ọ pụtara.
- 46
Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha banyere onye karịrị ibe ya ukwuu.
- 47
Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nʼakụkụ ya.
- 48
Ọ gwara ha sị,“Onye ọbụla nabatara nwata a nʼaha m, nabatara m. Onye ọ bụlakwa nabatara m, nabatara onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nʼetiti unu bụ onye kachasị ukwuu.”
- 49
Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.”
- 50
Jisọs sịrị ya,“Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”
- 51
Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem.
- 52
O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa;
- 53
ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem.
- 54
Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?”
- 55
Ọ tụgharịrị bara ha mba.
- 56
Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ.
- 57
Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke sịrị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”
- 58
Jisọs zara, sị,“Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ, ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe ọ na-atụkwasị isi.”
- 59
Ọ gwara onye ọzọ sị,“Soro m.” Ma ọ sịrị ya. Onyenwe anyị, “Biko, nye m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.”
- 60
Ma ọ sịrị ya,“Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha. Ma gị gaa kwusaa alaeze nke Chineke.”
- 61
Ma onye ọzọkwa, sịrị ya, “Aga m eso gị, Onyenwe m, ma kwere ka m buru ụzọ gaa sị ndị ezinaụlọ m nọdụnụ nke ọma.”
- 62
Jisọs sịrị ya,“Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke.”