Habakkuk 3
World English Bible (en) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru.
- 2
Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị. Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị. Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị, mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị. Nʼoke iwe gị chetakwa ebere.
- 3
Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. Sela Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa.
- 4
Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.
- 5
Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.
- 6
O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
- 7
Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.
- 8
Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
- 9
I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
- 10
Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.
- 11
Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.
- 12
I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
- 13
Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.
- 14
Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi, mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị, mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala, bụ ndị na-ezo onwe ha.
- 15
Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri, kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ.
- 16
Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.
- 17
A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
- 18
mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
- 19
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m, ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele. Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu.Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche.