Matthew 28
Vietnamese Bible (Cadman) (vi) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe ụbọchị izuike gasịrị, nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nʼime izu ụka, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ, gara ka ha lee ili ahụ.
- 2
Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya.
- 3
Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe.
- 4
Nʼihi egwu ya, ndị nche makwara jijiji. Daa nʼala nọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ.
- 5
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, “Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ.
- 6
Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu.
- 7
Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”
- 8
Ha ji oke egwu na ọṅụ pụọ ọsịịsọ site nʼili ahụ, gbara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya.
- 9
Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha,“Ndeewonụ!”Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya.
- 10
Ya mere Jisọs gwara ha sị,“Unu atụla egwu. Gaanụ, gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nʼebe ahụ.”
- 11
Mgbe ha na-aga, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nʼime obodo. Ha gara kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile mere.
- 12
Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego,
- 13
sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’
- 14
Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.”
- 15
Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.
- 16
Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa.
- 17
Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ.
- 18
Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị,“E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.
- 19
Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.
- 20
Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”