John 7
Open Basic Turkish New Testament (tr) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya.
- 2
Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso,
- 3
ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ.
- 4
Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
- 5
Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.
- 6
Jisọs sịrị ha,“Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile.
- 7
Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ.
- 8
Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.”
- 9
Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili.
- 10
Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo.
- 11
Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?”
- 12
E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.”
- 13
Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
- 14
Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe.
- 15
Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?”
- 16
Jisọs zara ha,“Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m.
- 17
Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke.
- 18
Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya.
- 19
Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?”
- 20
Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”
- 21
Jisọs zara sị ha,“Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya.
- 22
Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu.
- 23
Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike?
- 24
Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”
- 25
Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu?
- 26
Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst?
- 27
Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”
- 28
Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị,“Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya.
- 29
Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.”
- 30
Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.
- 31
Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”
- 32
Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.
- 33
Jisọs sịrị,“Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m.
- 34
Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”
- 35
Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe?
- 36
Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị,‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’na‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”
- 37
Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị,“Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri.
- 38
Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.”
- 39
O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto.
- 40
Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.”
- 41
Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta?
- 42
Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?”
- 43
Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya.
- 44
Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.
- 45
Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?”
- 46
Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.”
- 47
Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu?
- 48
Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi?
- 49
E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
- 50
Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha,
- 51
“Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?”
- 52
Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.”
- 53
Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.