Acts 9
Thai KJV (th) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Ma ugbu a, Sọl, onye ume niile ọ na-ekupụta bụ naanị ịba mba na igbu ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, gakwuuru onyeisi nchụaja,
- 2
rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem.
- 3
Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu.
- 4
Ọ dara nʼala, nụ olu na-akpọ ya oku,“Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?”
- 5
Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri,“Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.
- 6
Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.”
- 7
Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla.
- 8
Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs.
- 9
Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ, o nweghị ike iri nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ.
- 10
Otu onye nke na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, a na-akpọ Ananayas. Onyenwe anyị gwara ya nʼọhụ,“Ananayas!” Ọ sịrị, “Lee m, Onyenwe anyị.”
- 11
Onyenwe anyị gwara ya,“Gaa nʼụlọ Judas nke dị nʼokporoụzọ Guzoziri Eguzo, jụọ ajụjụ banyere onye a na-akpọ Sọl, onye si Tasọs, ọ nọ ugbu a na-ekpe ekpere.
- 12
Ọ hụla ọhụ na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, ibikwasị ya aka nʼisi ka ọ hụ ụzọ.”
- 13
Ma Ananayas zara, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ niile nwoke a mere ndị nsọ gị bi na Jerusalem.
- 14
Ugbu a, ọ natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja bịa nʼebe a ka o jide ndị niile na-akpọku aha gị.”
- 15
Ma Onyenwe anyị gwara ya,“Gaa, nʼihi na ahọpụtala m nwoke a ka ọ bụrụ ngwa ọrụ m, onye ga-ewegara mba ndị ọzọ, ndị eze na ụmụ Izrel aha m.
- 16
Mụ onwe m ga-egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịta nʼihi aha m.”
- 17
Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”
- 18
Otu mgbe ahụ, ihe dịka akpịrịkpa sitere nʼanya ya dapụta, o bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. O biliri ọtọ, e mee ya baptizim.
- 19
Mgbe o richara nri, ọ nwetakwara ike ya. Oziọma Sọl na Damaskọs Ya na ndị na-eso ụzọ Jisọs nọrọ na Damaskọs ọtụtụ ụbọchị.
- 20
Ngwangwa, o bidoro ikwusa Jisọs nʼụlọ nzukọ na-asị, Ọ bụ Ọkpara Chineke.
- 21
O juru ndị niile nụrụ ya anya, ha na asị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na-akpọku aha ahụ na Jerusalem? Ọ bụ na ọ bụghị maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja?”
- 22
Ma Sọl gara nʼihu baa ụba nʼike karịa na ikwu okwu nke gbara ndị Juu bi nʼobodo Damaskọs gharịị site nʼụzọ o siri gosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
- 23
Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ndị Juu gbara izu igbu ya.
- 24
Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ niile e si apụ nʼobodo ahụ nche, ka ha nwe ike gbuo ya.
- 25
Ma ụmụazụ ya kunyere ya na nkata amanyere ụdọ bufee ya nʼofe mgbidi nke obodo.
- 26
Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha.
- 27
Ma Banabas duuru ya gaa nʼebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu o siri hụ Onyenwe anyị na otu o siri gwakwa ya okwu. Na otu o siri kwusaa oziọma nʼaha Jisọs na Damaskọs na-atụghị egwu.
- 28
O soro ha na-agagharị na Jerusalem. Ọ na-ekwusakwa okwu nʼaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu.
- 29
Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtakwara ụka. Nʼihi ya ndị a gbara izu igbu ya.
- 30
Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs.
- 31
Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ.
- 32
Pita na-ejegharị nʼetiti ndị kwere ekwe, ọ gakwara leta ndị nsọ nọ nʼobodo Lida.
- 33
Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
- 34
Pita sịrị ya, “Ainias, Jisọs Kraịst agwọọla gị. Bilie mezie ute gị.” Ngwangwa, Ainias biliri ọtọ.
- 35
Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị.
- 36
Nʼobodo Jopa, e nwere otu onye nwanyị na-eso ụzọ ya, nke aha ya bụ Tabita nke pụtakwara Dọkas na asụsụ Griik. O jupụtara nʼọrụ ọma, na ọrụ obi ebere nʼebe ụmụ ogbenye nọ.
- 37
Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu.
- 38
Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.”
- 39
Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ.
- 40
Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala.
- 41
O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ.
- 42
A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị.
- 43
Ọ nọgidere na Jopa ọtụtụ ụbọchị. Ọ nọdụrụ nʼụlọ Saimọn, onye ọrụ ya bụ idozi akpụkpọ anụ.