John 18
De Heilige Schrift 1917 (nl) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya.
- 2
Judas, onye rara ya nye matakwara ebe ahụ. Nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ ọtụtụ oge.
- 3
Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha.
- 4
Ebe Jisọs maara ihe niile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ pụtara sị ha,“Onye ka unu na-achọ?”
- 5
Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha,“Ọ bụ m”(Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.)
- 6
Mgbe Jisọs gwara ha,“Ọ bụ m,”ha laghachiri azụ, daa nʼala.
- 7
Ọzọ ọ jụkwara ha,“Onye ka unu na-achọ?” Ha sịrị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.”
- 8
Jisọs zara,“Agwara m unu na Ọ bụ m. Ọ bụrụ na unu na-achọ m, hapụnụ ndị a ka ha laa.”
- 9
Nke a bụ iji mezuo okwu ahụ o kwuru na mbụ,“Etufughị m onye ọbụla nʼime ndị ahụ i nyere m.”
- 10
Ya mere Saimọn Pita, onye ji mma agha, mịpụtara ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Aha ohu ahụ bụ Malkus.
- 11
Ma Jisọs gwara Pita,“Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya! Ọ bụ na mụ agaghị aṅụ site nʼiko ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?”
- 12
Ya mere ndị agha ahụ na ọchịagha ha, na ndị na-ejere ndị Juu ozi, jidere Jisọs kee ya agbụ.
- 13
Ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas, onye bụ nna nwunye Kaịfas. Onye bụ onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ.
- 14
Kaịfas bụkwa onye ahụ dụrụ ndị ndu ndị Juu ọdụ, sị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile.
- 15
Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja.
- 16
Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita.
- 17
Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.”
- 18
Ndị ohu na ndị nche kwanyere ọkụ nʼihi na oyi na-atụ. Ha guzoro nʼebe ahụ na-anya ọkụ. Pita soro ha guzo na-anyakwa ọkụ.
- 19
Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya.
- 20
Jisọs zara ya,“Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo.
- 21
Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.”
- 22
Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?”
- 23
Jisọs zara ya,“Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.”
- 24
Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja.
- 25
Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.”
- 26
Otu nʼime ndị ohu onyeisi nchụaja, bụ onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, sịrị, “Ọ bụ na m ahụghị gị na ya nʼime ogige ahụ?”
- 27
Ma Pita gọkwara agọ ọzọ. Nʼotu mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.
- 28
Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga.
- 29
Pailet gakwuru ha nʼezi sị, “Gịnị bụ ebubo unu na-ebo nwoke a?”
- 30
Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.”
- 31
Pailet sịrị, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nʼonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu sịrị ya, “Ma anyị enweghị ikike igbu onye o bụla.”
- 32
Nke a mere iji mezuo okwu ahụ Jisọs kwuru banyere ụdị ọnwụ ọ gaje ịnwụ.
- 33
Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?”
- 34
Jisọs zara,“Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?”
- 35
Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?”
- 36
Jisọs zara,“Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.”
- 37
Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara,“Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.”
- 38
Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya.
- 39
Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?”
- 40
Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu.