Luke 8
Reina-Valera 1909 (es) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya,
- 2
na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,
- 3
na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.
- 4
Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ ha na ndị mmadụ si nʼobodo dị iche iche bịakwute ya. Ọ tụụrụ ha ilu a sị,
- 5
“Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo.
- 6
Ụfọdụ nʼime ha dakwasịrị nʼelu nkume. Mgbe ha puputara chọọ ito, ha kpọnwụrụ nʼihi na mgbọrọgwụ ha enweghị ike ịmịta mmiri mkpụrụ ahụ ga-eji dị ndụ.
- 7
Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha.
- 8
Ụfọdụ nʼime mkpụrụ dara nʼezi ala. Ha puputara, too, mịa mkpụrụ dị otu narị nʼọnụọgụgụ.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ sịrị ha,“Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”
- 9
Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara.
- 10
Ọ sịrị,“Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a, “ ‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla. Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’
- 11
“Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.
- 12
Mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta.
- 13
Mkpụrụ ndị ahụ dara nʼelu nkume nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-ekwere naanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara ha na-adachapụ.
- 14
Mkpụrụ nke dara nʼetiti ogwu nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga nʼụzọ ha, echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ, mee ka ha ghara ịmị mkpụrụ.
- 15
Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nʼezi ala nọchiri anya ndị jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
- 16
“Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
- 17
Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè.
- 18
Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.”
- 19
Nʼoge a, nne ya na ụmụnne ya nwoke bịakwutere ya. Ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nʼihi igwe mmadụ.
- 20
Otu onye gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo nʼezi, ha chọrọ ịhụ gị.”
- 21
Ọ zara sị,“Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ya mere ihe.”
- 22
Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha,“Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.”Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ,
- 23
ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.
- 24
Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii.
- 25
Ọ sịrị ha,“Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”
- 26
Ha kwọrọ ụgbọ mmiri rute nʼala Gerazin, nke dị nʼofe mmiri Galili.
- 27
Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu.
- 28
Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ.”
- 29
Nʼihi na o nyela mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o site nʼime ya pụta. Ọtụtụ oge, mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike, nʼagbanyeghị na eji ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, debe ebe a na-eche ya nche, ọ na-adọbisi ụdọ igwe e ji kee ya, mmụọ ọjọọ a na-eduru ya gaa nʼime ọzara.
- 30
Jisọs jụrụ ya sị,“Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Lijiọn,” nʼihi na igwe mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.
- 31
Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis.
- 32
Igwe ezi nọ nʼakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nʼime ha. Jisọs nyere ha ike.
- 33
Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nʼime nwoke a pụọ banye nʼime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ niile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nʼime mmiri ebe osimiri riri ha.
- 34
Mgbe ndị na-elekọta ezi ahụ hụrụ ihe mere, ha gbara ọsọ gaa nʼime obodo na nʼobodo nta niile dị gburugburu ebe ahụ kọsaa ihe mere.
- 35
Ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe mere. Mgbe ha rutere ebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ, ebe ọ nọdụrụ ala yiri uwe ma nọrọkwa nʼezi uche ya. Egwu tụrụ ha.
- 36
Ndị hụrụ ka ihe a si mee kọọrọ ha ka e siri gwọọ onye ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu.
- 37
Mgbe ahụ, ndị niile bi na Gerazin na nʼobodo gbara ebe ahụ gburugburu rịọrọ Jisọs ka ọ hapụrụ ha obodo ha, nʼihi na egwu dị ukwuu tụrụ ha. Ọ banyekwara nʼime ụgbọ mmiri ahụ laghachi.
- 38
Nwoke a e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ rịọrọ ya ka o soro ya ma o zilagara ya, sị ya,
- 39
“Laghachi nʼezinaụlọ gị kọọrọ ha ihe niile Chineke meere gị.”Nwoke ahụ lara, gbasaa akụkọ ihe Jisọs meere ya nʼobodo ahụ niile.
- 40
Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya.
- 41
Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya.
- 42
Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya.
- 43
Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya.
- 44
O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.
- 45
Jisọs sịrị,“Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.”
- 46
Ma Jisọs sịrị,“Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ.”
- 47
Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya.
- 48
Ọ gwara ya sị,“Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo.”
- 49
Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.”
- 50
Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị,“Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya.”
- 51
Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ.
- 52
Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha,“Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra.”
- 53
Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ.
- 54
Ma o jidere ya nʼaka, sị,“Nwa m, bilie!”
- 55
Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. Ọ gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie.
- 56
Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma ọ nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.