Mark 1
Open Nova Bíblia Viva (pt-BR) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke.
- 2
Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.”
- 3
“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”
- 4
Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
- 5
Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
- 6
Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
- 7
O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.
- 8
Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
- 9
Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim.
- 10
Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya.
- 11
Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
- 12
Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara.
- 13
Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi.
- 14
Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke.
- 15
Ọ sịrị,“Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”
- 16
Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ.
- 17
Jisọs siri ha,“Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
- 18
Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya.
- 19
Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha.
- 20
Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya.
- 21
Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe.
- 22
Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu.
- 23
Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu,
- 24
sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.”
- 25
Ma Jisọs baara ya mba sị ya,“Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!”
- 26
Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta.
- 27
Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.”
- 28
Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.
- 29
Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru.
- 30
Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya.
- 31
Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa.
- 32
Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha.
- 33
Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ.
- 34
Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ.
- 35
Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.
- 36
Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya.
- 37
Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!”
- 38
Ọ zaghachiri ha sị,“Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.”
- 39
Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.
- 40
Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
- 41
Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị,“Achọrọ m, dị ọcha!”
- 42
Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha.
- 43
Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya,
- 44
ọ gwara ya sị,“Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
- 45
Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.