Mark 8
Bíblia Portuguesa Mundial (pt-BR) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Nʼoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha,
- 2
“Enwere m ọmịiko nʼebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eri.
- 3
Ọ bụrụ na m ezilaga ha nʼụlọ ha, ụfọdụ nʼime ha ga-ada nʼụzọ nʼihi agụụ. Nʼihi na ụfọdụ ha si nʼebe dị anya bịa.”
- 4
Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?”
- 5
Jisọs jụrụ ha sị,“Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha zara sị, “Asaa.”
- 6
Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ.
- 7
Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya.
- 8
Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa.
- 9
Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha.
- 10
Ngwangwa, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼakụkụ obodo Dalmanuta.
- 11
Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya.
- 12
Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị,“Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.”
- 13
Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.
- 14
Ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Ọ bụ naanị otu ogbe achịcha fọdụụrụ ha nʼime ụgbọ.
- 15
Ọ dọrọ ha aka na ntị sị,“Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.”
- 16
Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụ nʼihi na anyị enweghị achịcha.”
- 17
Mgbe Jisọs ghọtara isi mkparịta ụka ha, ọ jụrụ ha sị,“Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu maka enweghị achịcha? Ọ pụtara na unu adịghị ahụ maọbụ aghọta? Obi unu o siri ike?
- 18
Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta?
- 19
Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.”
- 20
“Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.”
- 21
Ọ sịrị ha,“Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”
- 22
Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka,
- 23
Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị,“Ị na-ahụ ihe ọbụla?”
- 24
Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị.”
- 25
Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma.
- 26
Ọ zilagara ya ụlọ ya sị ya,“Abanyekwala nʼime obodo.”
- 27
Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị,“Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”
- 28
Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
- 29
Ma ọ jụrụ ha sị,“Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst ahụ.”
- 30
Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya.
- 31
Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị.
- 32
Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba.
- 33
Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya,“Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.”
- 34
Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị,“Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ.
- 35
Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya.
- 36
Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha?
- 37
Ọ dị ihe ọzọ dị nʼụwa mmadụ nwere ike iji gbanwere ndụ ya?
- 38
Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”