Luke 24
新改訳新約聖書 (1965) (ja) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ.
- 2
Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ.
- 3
Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs.
- 4
Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso.
- 5
Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ?
- 6
Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị,
- 7
‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ”
- 8
Mgbe ahụ ha chetara okwu ya.
- 9
Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a.
- 10
Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a.
- 11
Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu.
- 12
Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
- 13
Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem.
- 14
Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere.
- 15
Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije.
- 16
Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya.
- 17
Ọ sịrị ha,“Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha.
- 18
Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?”
- 19
Ọ sịrị ha,“Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile.
- 20
Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe.
- 21
Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere.
- 22
Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a.
- 23
Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ.
- 24
Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.”
- 25
Ọ sịrị ha,“Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru.
- 26
Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?”
- 27
Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile.
- 28
Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya.
- 29
Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha.
- 30
Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha.
- 31
Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ.
- 32
Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?”
- 33
Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe,
- 34
na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.”
- 35
Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
- 36
Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha,“Udo dịrị unu.”
- 37
Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ.
- 38
Ma ọ sịrị ha,“Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ?
- 39
Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.”
- 40
Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya.
- 41
Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha,“Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?”
- 42
Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ.
- 43
Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha.
- 44
Mgbe ahụ, ọ sịrị ha,“Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.”
- 45
Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ.
- 46
Ọ sịrị ha,“Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ.
- 47
Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem.
- 48
Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.
- 49
Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.”
- 50
O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha.
- 51
Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe.
- 52
Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem.
- 53
Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.