John 9
新改訳新約聖書 (1965) (ja) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya.
- 2
Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?”
- 3
Jisọs sịrị,“Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya.
- 4
Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ.
- 5
Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.”
- 6
Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya.
- 7
Ọ gwara ya,“Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị”(nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ.
- 8
Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?”
- 9
Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.”
- 10
Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?”
- 11
Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.”
- 12
Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.”
- 13
Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii.
- 14
Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya.
- 15
Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
- 16
Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.
- 17
Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”
- 18
Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya.
- 19
Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?”
- 20
Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya.
- 21
Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.”
- 22
Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha.
- 23
Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.”
- 24
Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.”
- 25
Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”
- 26
Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
- 27
Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?”
- 28
Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis.
- 29
Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”
- 30
Nwoke ahụ zaghachiri sị ha, “Ma otu ọ dị, nke a bụ ihe ịtụnanya! Unu amaghị ebe o sịrị bịa ma o meghere anya m.
- 31
Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.
- 32
Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì.
- 33
Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”
- 34
Ha zara sị ya, “Gị onye a mụrụ nʼime mmehie, ị na-achọ ikuziri anyị ihe?” Ha chụpụrụ ya nʼezi.
- 35
Jisọs nụrụ na ha achụpụla ya nʼezi, ma mgbe ọ chọtara ya, ọ sịrị ya,“I kweere na Nwa nke Mmadụ?”
- 36
Ọ zara sị, “Onyenwe m, ọ bụ onye? Gwa m ka m nwe ike ikwere na ya.”
- 37
Jisọs sịrị ya,“Ị hụla ya ugbu a; onye gị na ya na-ekwurịta okwu bụ onye ahụ.”
- 38
Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.
- 39
Jisọs sịrị,“Ọ bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.”
- 40
Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị ya, “Anyị onwe anyị, anyị bụkwa ndị kpuru ìsì?”
- 41
Jisọs sịrị ha,“Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”