John 2
King James Version (en) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Nʼụbọchị nke atọ, o nwere mmemme agbamakwụkwọ na Kena nke Galili, nne Jisọs bịakwara ebe ahụ.
- 2
A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oku na mmemme agbamakwụkwọ a.
- 3
Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, “Ha enweghị mmanya.”
- 4
Jisọs sịrị ya,“Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị.”
- 5
Nne ya gwara ndị na-eje ozi, “Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya.”
- 6
A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.
- 7
Jisọs gwara ha,“Gbajuonụ ite ndị a mmiri.”Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri.
- 8
Mgbe ahụ, ọ gwara ha,“Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche.” Ha mekwara nke a.
- 9
Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche
- 10
sị ya, “Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a.”
- 11
Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.
- 12
Mgbe nke a gasịrị, ọ gara Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya, nakwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ụbọchị ole na ole nʼebe ahụ.
- 13
Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem.
- 14
Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego.
- 15
Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu.
- 16
Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru,“Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ebe a na-azụ ahịa.”
- 17
Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, “Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi.”
- 18
Ma ndị Juu sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị pụrụ igosi anyị na ikike i ji eme ihe ndị a.”
- 19
Jisọs zara sị,“Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.”
- 20
Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?”
- 21
Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya.
- 22
Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru.
- 23
Mgbe ọ nọ na Jerusalem nʼoge Mmemme Ngabiga, ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe ịrịbama o mere kweere na ya.
- 24
Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nʼihi na ọ matara mmadụ niile nke ọma.
- 25
Ọ dịghị ya mkpa ka onye ọbụla gbaa akaebe banyere ụmụ mmadụ, nʼihi na ya onwe ya maara ihe dị nʼime mmadụ.