John 6
Sainte Bible libre pour le monde (fr) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas).
- 2
Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa.
- 3
Jisọs rigooro nʼelu ugwu nọdụ ala ya na ndị na-eso ụzọ ya.
- 4
Nʼoge a, mmemme oriri Ngabiga ndị Juu na-abịa nso.
- 5
Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip,“Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”
- 6
Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme.
- 7
Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.”
- 8
Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara,
- 9
“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?”
- 10
Jisọs sịrị,“Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.”E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.
- 11
Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.
- 12
Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,“Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.”
- 13
Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.
- 14
Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”
- 15
Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.
- 16
Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,
- 17
ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.
- 18
Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.
- 19
Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha.
- 20
Ma ọ sịrị ha,“Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”
- 21
Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.
- 22
Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ.
- 23
Mgbe ahụ ụfọdụ ụgbọ mmiri si Tiberịas bịara kwụsị nso nso ebe ahụ ndị mmadụ nọ rie achịcha mgbe Onyenwe anyị nyechara ekele maka ya.
- 24
Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs.
- 25
Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?”
- 26
Jisọs sịrị ha,“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.
- 27
Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”
- 28
Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”
- 29
Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”
- 30
Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ?
- 31
Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’ ”
- 32
Jisọs sịrị ha,“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe.
- 33
Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”
- 34
Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”
- 35
Jisọs sịrị ha,“Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
- 36
Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
- 37
Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.
- 38
Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m.
- 39
Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.
- 40
Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”
- 41
Nʼihi nke a, ndị Juu bidoro itamu ntamu megide ya nʼihi na ọ sịrị,“Abụ m achịcha ahụ siri nʼeluigwe rịdata.”
- 42
Ha sịrị, “Onye a ọ bụghị Jisọs, nwa Josef, bụ onye anyị matara nne na nna ya? Oleekwanụ otu o si ekwu ugbu a sị,‘Esi m nʼeluigwe rịdata’?”
- 43
Jisọs zara sị ha,“Unu atamula nʼetiti onwe unu.
- 44
O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.
- 45
E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’ Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.
- 46
O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ.
- 47
Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi.
- 48
Abụ m achịcha nke ndụ.
- 49
Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ.
- 50
Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ.
- 51
Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.”
- 52
Mgbe ahụ, ndị Juu bidoro na-arụrịta ụka ike nʼetiti onwe ha sị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?”
- 53
Jisọs sịrị ha,“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, naanị ma unu riri anụ ahụ Nwa nke Mmadụ ma ṅụọkwa ọbara ya, unu agaghị enwe ndụ nʼime onwe unu.
- 54
Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ.
- 55
Nʼihi na anụ ahụ m bụ ezigbo nri, ọbara m bụkwa ezigbo ihe ọṅụṅụ.
- 56
Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya.
- 57
Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m.
- 58
Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
- 59
O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm.
- 60
Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?”
- 61
Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha,“Nke a ọ na-ewute unu?
- 62
Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ.
- 63
Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.
- 64
Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.”Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye.
- 65
Ọ sịrị,“Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.”
- 66
Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.
- 67
Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ,“Unu chọkwara iso ha pụọ?”
- 68
Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
- 69
Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”
- 70
Jisọs zara ha,“Ọ bụghị m họpụtara unu mmadụ iri na abụọ? Ma otu onye nʼime unu bụ ekwensu!”
- 71
Ọ na-ekwu banyere Judas nwa Saimọn Iskarịọt, onye nʼagbanyeghị na ọ bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ, bụ onye ga-arara ya nye.