Jeremiah 45
Bible J.N. Darby (fr) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Okwu ndị Jeremaya onye amụma gwara Baruk nwa Neraya, mgbe o dere okwu ndị a nʼakwụkwọ dịka Jeremaya na-akpọpụta ha, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda. Jeremaya gwara Baruk sị,
- 2
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel na-agwa gị, gị Baruk,
- 3
Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’
- 4
Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile.
- 5
Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka ị jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ị ga-eje. ’ ”