Matthew 12
Unrevised Elberfelder 1905 (de) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Nʼoge ahụ, Jisọs sitere nʼubi a kụrụ ọka na-agafe nʼụbọchị izuike. Ma ebe agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha malitere ịghọ ogbe ọka, na ịta mkpụrụ ya.
- 2
Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi ime nʼụbọchị izuike!”
- 3
Ma ọ zara ha sị,“Ọ bụ na unu agụtaghị ihe Devid na ndị ya na ha soo mere mgbe agụụ na-agụ ha?
- 4
Otu o si banye nʼụlọ Chineke, ya na ndị so ya, rie achịcha a na-eche nʼihu Chineke, nke na-ezighị ezi nʼiwu ka ha rie, kama ọ dịịrị naanị ndị nchụaja iri ya.
- 5
Ka ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nʼime akwụkwọ iwu Mosis na ndị nchụaja na-emerụ ụbọchị izuike nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma ọ dịghị onye na-ata ha ụta?
- 6
Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọnsọ ukwu nọ nʼebe a.
- 7
Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.
- 8
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izuike.”
- 9
O sitere nʼebe ahụ pụọ banye nʼụlọ nzukọ ha.
- 10
Nʼebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nʼebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ mmadụ nʼụbọchị izuike?”
- 11
Ma ọ zara ha sị,“Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu nwere otu atụrụ danyere nʼime olulu nʼụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ahapụ ya nʼebe ahụ? Ọ gaghị ejide ya dọpụta ya?
- 12
Mmadụ ọ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, o ziri ezi nʼiwu bụ ịrụ ọrụ ọma nʼụbọchị izuike.”
- 13
Mgbe ahụ ọ sịrị nwoke ahụ,“Setịpụ aka gị.”Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.
- 14
Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
- 15
Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile.
- 16
Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ.
- 17
Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru,
- 18
“Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
- 19
Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghị etisikwa mkpu ike. O nweghị onye ga-anụ olu okwu ya nʼezi.
- 20
Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara nʼala, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị, tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie.
- 21
Ọ bụkwa nʼaha ya ka mba niile dị nʼụwa ga-atụkwasị olileanya ha.”
- 22
Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu.
- 23
Ihe a juru igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ anya. Nʼihi ya, ha kwuru sị, “Nwoke a, ọ ga-abụ Nwa Devid?”
- 24
Mgbe ndị Farisii nụrụ nke a, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nʼihi na Belzebub, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.”
- 25
Ma ebe ọ matara ihe ha na-eche nʼobi ha. Ọ gwara ha okwu sị,“Alaeze ọbụla kewara megide onwe ya ga-ada. Obodo o bụla maọbụ ezinaụlọ ọbụla kewara megide onwe ya agaghị eguzo.
- 26
Ọ bụrụ na ekwensu achụpụ ekwensu, o kewala megide onwe ya. Oleekwanụ otu alaeze ya ga-esi guzo.
- 27
Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub, ọ bụ nʼike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nʼihi okwu a unu kwuru.
- 28
Ma ọ bụrụ na m na-esite nʼike Mmụọ nke Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nʼetiti unu.
- 29
“Ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo niile dị nʼụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ? Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo niile dị nʼụlọ nwoke ahụ.
- 30
“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
- 31
Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmehie na nkwulu niile. Ma agaghị agbaghara nkwulu ekwuluru Mmụọ Nsọ.
- 32
Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa.
- 33
“Ọ bụrụ na e mee ka osisi too nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọma, ma ọ bụrụ na o toghị nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọjọọ. Nʼihi na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya.
- 34
Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta.
- 35
Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe.
- 36
Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru.
- 37
Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”
- 38
Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, “Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama.”
- 39
Ma ọ zara sị ha,“Ọ bụ naanị ajọ ọgbọ nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịbama. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịbama Jona onye amụma.
- 40
Nʼihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼafọ azụ dị ukwuu, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼobi nke ala.
- 41
Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe. Nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona. Ma lee onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.
- 42
Nʼụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị nke Ndịda ga-eso ọgbọ a bilie boo ya ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nʼihi na o siri nʼebe dị ụwa sọtụrụ bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nʼebe a, ma unu jụrụ i kwere na ya.
- 43
“Mgbe mmụọ na-adịghị ọcha si nʼime mmadụ pụọ, ọ na-agabiga nʼọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe izuike, ma ọ naghị achọta ya.
- 44
Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m, ebe m si pụta.’ Mgbe ọ lọghachiri, ọ na-achọpụta na a zachara ụlọ ahụ dozie ya, ọ dịkwaghị onye bichiri nʼime ya.
- 45
Mgbe ahụ, ọ na-apụ gaa chọta mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha niile na-abata bịa biri nʼime onye ahụ. Mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị ndị bi nʼọgbọ a jọrọ njọ.”
- 46
Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu.
- 47
Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ gwara ya okwu sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na-achọ ịhụ gị nʼezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.”
- 48
Ma ọ zara onye ahụ gwara ya okwu sị,“Onye bụ nne m? Olee ndị bụ ụmụnne m ndị nwoke?”
- 49
Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka, sị,“Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke.
- 50
Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe Nna m bi nʼeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, nakwa nne m.”