Mark 2
Bíblia Livre Para Todos (pt) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe ụbọchị ole na ole gafesịrị, ọ bataghachiri na Kapanọm. Ndị mmadụ nụrụ na ọ lọghachila.
- 2
Igwe mmadụ zukọtara nʼime ụlọ ahụ nke mere na ohere afọdụghị ọ bụladị nʼọnụ ụzọ. O kwusakwaara ha oziọma.
- 3
Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya.
- 4
Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina.
- 5
Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ,“Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị.”
- 6
Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị,
- 7
“Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?”
- 8
Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. Ọ sịrị ha,“Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu?
- 9
Olee nke ka mfe: ọ bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ i sị, ‘Bilie chịrị ute gị jegharịa?’
- 10
Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.”Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ,
- 11
“Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị.”
- 12
O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”
- 13
Emesịa, Jisọs pụrụ gaa nʼakụkụ osimiri ahụ. Igwe mmadụ bịakwutere ya. Ọ malitere izi ha ihe.
- 14
Mgbe ọ na-aga nʼihu, ọ hụrụ Livayị nwa Alfiọs ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya,“Soro m,”o biliri sooro ya.
- 15
Mgbe ọ na-eri nri uhuruchi nʼụlọ Livayị, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ, nʼihi na ndị na-esogharị ya dị ọtụtụ.
- 16
Mgbe ndị ozizi iwu nke ndị Farisii hụrụ ya ka o so ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere o ji eso ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-erikọ nri?”
- 17
Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị ha,“Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume kama ndị mmehie.”
- 18
Nʼoge a, ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. Ndị mmadụ bịara jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị nke gị adịghị ebu ọnụ?”
- 19
Jisọs sịrị ha,“O kwesiri na ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwunye ga-ebu ọnụ mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ nʼetiti ha? Ha apụghị ibu ọnụ ogologo oge ya na ha nọ.
- 20
Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Nʼụbọchị ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
- 21
“Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa. Ọ bụrụ na o mee nke a, akwa ọhụrụ ahụ ga-adọkapụ site na nke ochie mee ka ndọka ya dị njọ karịa.
- 22
Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
- 23
Otu ụbọchị izuike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Dị ka ha na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ụfọdụ ogbe ọka nʼime ọka ndị ahụ.
- 24
Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.”
- 25
Ma ọ sịrị ha,“Unu agụtaghị ihe Devid na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha?
- 26
Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.”
- 27
Mgbe ahụ, ọ gwakwara ha sị,“E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, emeghị mmadụ maka ụbọchị izuike.”
- 28
Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị izuike.