Matthew 22
IRV Bengali (bn) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị,
- 2
“Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke.
- 3
O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa.
- 4
“O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’
- 5
“Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya.
- 6
Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha.
- 7
Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ.
- 8
“Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi.
- 9
Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’
- 10
Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.
- 11
“Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye.
- 12
Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa.
- 13
“Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
- 14
“Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.”
- 15
Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya.
- 16
Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ.
- 17
Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?”
- 18
Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha,“Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa?
- 19
Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.”Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego.
- 20
Ọ jụrụ ha ajụjụ sị,“Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?”
- 21
Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ ọ gwara ha sị,“Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.”
- 22
Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbagwojuru ha anya, nʼihi ya, ha hapụrụ ya pụọ.
- 23
Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ.
- 24
Onye ozizi, “Mosis kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa.
- 25
Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya.
- 26
Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa.
- 27
Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara.
- 28
Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?”
- 29
Jisọs zara ha sị,“Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere.
- 30
Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.
- 31
Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị,
- 32
Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.”
- 33
Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya.
- 34
Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe.
- 35
Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya:
- 36
“Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?”
- 37
Ọ zara sị ya,“ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’
- 38
Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile.
- 39
Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’
- 40
Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”
- 41
Mgbe ndị Farisii gbakọrọ nʼotu ebe, Jisọs jụrụ ha,
- 42
“Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Nwa onye ka ọ bụ?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devid.”
- 43
Ọ sịrị ha,“Gịnị mekwaranụ Devid site na ntụziaka nke Mmụọ Nsọ jiri kpọọ ya ‘Onyenwe m’? Nʼihi na ọ sịrị,
- 44
“ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị ya, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’
- 45
Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị,’ oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?”
- 46
Ọ dịghị onye pụrụ ịsa ya okwu. Sitekwa nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị onye ọbụla nwere anya ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.