Matthew 16
IRV Bengali (bn) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara ya sị, “Gosi anyị ihe ịrịbama si nʼeluigwe.”
- 2
Ọ zara ha,“Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’
- 3
Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara.
- 4
Ajọ ọgbọ nke jupụtara nʼịkwa iko, nke na-arịọkwa ihe ịrịbama. Ọ nweghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi ya karịa ihe ịrịbama Jona.”Mgbe ahụ ọ sitere nʼebe ahụ ha nọ pụọ.
- 5
Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla.
- 6
Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha,“Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”
- 7
Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla.
- 8
Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị,“Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha?
- 9
Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru?
- 10
Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?
- 11
Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”
- 12
Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii.
- 13
Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha,“Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?”
- 14
Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
- 15
Ọ jụrụ ha sị,“Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
- 16
Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”
- 17
Jisọs gwara ya sị,“Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya.
- 18
Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya.
- 19
Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.”
- 20
Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ.
- 21
Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.
- 22
Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!”
- 23
Ma o chigharịrị sị Pita,“Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.”
- 24
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị,“Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ.
- 25
Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya.
- 26
Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya?
- 27
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
- 28
“Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”