John 4
IRV Bengali (bn) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Ugbu a, Jisọs matara na ndị Farisii anụla na ọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya na-emekwa baptizim karịa Jọn.
- 2
Ma ọ bụkwaghị Jisọs na onwe ya na-eme baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim.
- 3
Ọ hapụrụ Judịa laghachi azụ na Galili.
- 4
Ma ọ ga-esite nʼetiti Sameria gafee.
- 5
Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke.
- 6
Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie.
- 7
Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya,“Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.”
- 8
(Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.)
- 9
Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.)
- 10
Jisọs zara sị,“Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.”
- 11
Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a.
- 12
Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?”
- 13
Jisọs zara sị,“Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ.
- 14
Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.”
- 15
Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.”
- 16
Ọ gwara ya sị,“Gaa kpọta di gị ma lọghachi.”
- 17
Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.” Jisọs sịrị ya,“I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di.
- 18
I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.”
- 19
Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma.
- 20
Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.”
- 21
Jisọs sịrị ya,“Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem.
- 22
Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu.
- 23
Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.
- 24
Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
- 25
Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.”
- 26
Jisọs sịrị ya,“Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.”
- 27
Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?”
- 28
Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ,
- 29
“Bịanụ lee otu nwoke onye gwara m ihe niile m merela. Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst ahụ?”
- 30
Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya.
- 31
Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.”
- 32
Ma ọ sịrị ha,“Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.”
- 33
Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?”
- 34
Jisọs sịrị ha,“Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya.
- 35
Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ.
- 36
Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ.
- 37
Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’
- 38
E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.”
- 39
Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.”
- 40
Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ.
- 41
Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya.
- 42
Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
- 43
Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.
- 44
(Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.)
- 45
Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ.
- 46
Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm.
- 47
Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.
- 48
Jisọs sịrị ya,“Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.”
- 49
Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”
- 50
Jisọs sịrị ya,“Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa.
- 51
Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma.
- 52
Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.”
- 53
Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya,“Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.”Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.
- 54
Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.