Matthew 9
American Standard Version (en) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya.
- 2
Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya,“Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.”
- 3
Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.”
- 4
Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị,“Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu?
- 5
Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’?
- 6
Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.”Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ,“Bilie, chịrị ute gị laa!”
- 7
Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya.
- 8
Mgbe igwe mmadụ a hụrụ ihe ahụ mere, akpata oyi jụrụ ha nʼahụ nʼihi egwu. Ha tokwara Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ikike dị otu a.
- 9
Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya,“Soro m.”Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya.
- 10
Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri.
- 11
Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”
- 12
Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị,“Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa.
- 13
Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.”
- 14
Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?”
- 15
Jisọs jụrụ ha sị,“O kwesiri ka ndị enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọrọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị ọhụrụ nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ di nwanyị ọhụrụ nʼetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.
- 16
“Ọ dịghị onye na-eji akwa ọhụrụ kwachie ebe akwa ochie siri dọkaa, nʼihi na akwa ahụ ga-esi nʼebe a kwachiri ya dọwaa; mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
- 17
Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ochie, nʼihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-echekwa ha abụọ nke ọma.”
- 18
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi ụlọ ekpere bịara kpọọ isiala nye ya, sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwanyị nwụrụ. Otu ọ dị, bịa ka ị bikwasị ya aka gị. Ọ ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ.”
- 19
Nʼihi nke a, Jisọs soro ya gawa. Ndị na-eso ụzọ ya sokwara ha.
- 20
Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka.
- 21
Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.”
- 22
Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya,“Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.”Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ.
- 23
Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja.
- 24
Ọ sịrị ha,“Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ nọ nʼụra.”Ma ha chịrị ya ọchị.
- 25
Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ.
- 26
Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ.
- 27
Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!”
- 28
Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị,“Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.”
- 29
O metụrụ ha aka nʼanya sị ha,“Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.”
- 30
Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha“Unu agwakwala onye ọbụla.”
- 31
Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ.
- 32
Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya.
- 33
Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.”
- 34
Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, na-enye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.”
- 35
Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche.
- 36
Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.
- 37
Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,“Owuwe ihe ubi hiri nne nʼezie. Ma ndị ọrụ dị ole na ole.
- 38
Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya.”