Luke 7
Arabic Van Dyck (ar) → Biblica Igbo Contemporary Bible (ig)
- 1
Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, ọ banyere na Kapanọm.
- 2
Ma e nwere otu ọchịagha nke nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ.
- 3
Mgbe ọ nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya.
- 4
Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, “O kwesiri ka i mere ya ihe a.
- 5
Nʼihi na ọ hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.”
- 6
Jisọs sooro ha gawa. Ma mgbe ọ nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, “Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m.
- 7
Ọ bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ọ ga-agwọkwa odibo m.
- 8
Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a ‘gaa,’ ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ ‘bịa,’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a,’ ọ na-emekwa ya.”
- 9
Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị,“Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ọ bụladị nʼIzrel.”
- 10
Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.
- 11
O ruo mgbe nwa oge gasịrị, ọ gara nʼobodo a na-akpọ Nain. Ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ ndị ọzọ sooro ya gaa.
- 12
Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya.
- 13
Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya,“Ebela akwa.”
- 14
Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị,“Nwokorobịa, asị m gị bilie!”
- 15
Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya.
- 16
Egwu tụrụ ha niile, ha tokwara Chineke sị, “Onye amụma dị ukwuu apụtala nʼetiti anyị, Chineke abịala inyere ndị ya aka!”
- 17
Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
- 18
Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya maka ihe ndị a niile. Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya,
- 19
zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?”
- 20
Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ”
- 21
Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ.
- 22
Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị,“Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma.
- 23
Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
- 24
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị,“Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?
- 25
Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze.
- 26
Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma.
- 27
Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
- 28
Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.”
- 29
(Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim.
- 30
Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)
- 31
Ọ gara nʼihu sị ha,“Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri?
- 32
Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị, “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu adịghị ete egwu. Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu, ma unu ebeghị akwa.’
- 33
Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’
- 34
Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’
- 35
Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”
- 36
Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri.
- 37
Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ.
- 38
Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha.
- 39
Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.”
- 40
Jisọs zara ya sị,“Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.”
- 41
“Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise.
- 42
Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?”
- 43
Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya,“Ị kpeziri.”
- 44
Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị,“Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.
- 45
Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ.
- 46
Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ.
- 47
Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.”
- 48
Mgbe ahụ ọ gwara ya sị,“A gbagharala gị mmehie gị.”
- 49
Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?”
- 50
Ọ sịrị nwanyị ahụ,“Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”